Ọrụ Ndị Ozi 19

Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”

Acts 19:21 (UKJV) After these things were ended, Paul purposed in the spirit, when he had passed through Macedonia and Achaia, to go to Jerusalem, saying, After I have been there, I must also see Rome.

19Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.

20Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.

21Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”

22O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.

23Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.