Ọrụ Ndị Ozi 19

O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.

Acts 19:22 (UKJV) So he sent into Macedonia two of them that ministered unto him, Timotheus and Erastus; but he himself stayed in Asia for a season.

20Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.

21Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”

22O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.

23Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.

24Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.