Ọrụ Ndị Ozi 2

Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.

Acts 2:2 (UKJV) And suddenly there came a sound from heaven as of a rushing mighty wind, and it filled all the house where they were sitting.

1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe.

2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.

3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.

4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.