Ọrụ Ndị Ozi 2

Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.

Acts 2:3 (UKJV) And there appeared unto them cloven tongues like of fire, and it sat upon each of them.

1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe.

2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.

3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.

4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.

5Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.