1Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.
2Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.
3Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.