Ọrụ Ndị Ozi 20

Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.

Acts 20:2 (UKJV) And when he had gone over those parts, and had given them much exhortation, he came into Greece,

1Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.

2Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.

3Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.

4Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.