Ọrụ Ndị Ozi 20

Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.

Acts 20:17 (UKJV) And from Miletus he sent to Ephesus, and called the elders of the church.

15Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.

16Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.

17Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.

18Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.

19Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.