17Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.
18Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.
19Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.
20Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.
21E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.