Ọrụ Ndị Ozi 20

E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.

Acts 20:21 (UKJV) Testifying both to the Jews, and also to the Greeks, repentance toward God, and faith toward our Lord Jesus Christ.

19Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.

20Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.

21E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.

22“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.

23Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.