Ọrụ Ndị Ozi 23

Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”

Acts 23:11 (UKJV) And the night following the Lord stood by him, and said, Be of good cheer, Paul: for as you have testified of me in Jerusalem, so must you bear witness also at Rome.

9Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?”

10Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.

11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”

12Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.

13Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.