11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
12Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
13Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
14Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
15Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”