10Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
12Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
13Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
14Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.