13Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
14Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
15Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
16Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
17“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.