15Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
16Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
17“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
18Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
19Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.