Ọrụ Ndị Ozi 24

Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.

Acts 24:18 (UKJV) Whereupon certain Jews from Asia found me purified in the temple, neither with multitude, nor with tumult.

16Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.

17“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.

18Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.

19Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.

20Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.