Ọrụ Ndị Ozi 24

Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.

Acts 24:20 (UKJV) Or else let these same here say, if they have found any evil doing in me, while I stood before the council,

18Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.

19Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.

20Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.

21Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”

22Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.