Ọrụ Ndị Ozi 24

Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”

Acts 24:21 (UKJV) Except it be for this one voice, that I cried standing among them, Concerning the resurrection of the dead I am called in question by you this day.

19Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.

20Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.

21Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”

22Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”

23O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.