Ọrụ Ndị Ozi 24

Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”

Acts 24:22 (UKJV) And when Felix heard these things, having more perfect knowledge of that way, he deferred them, and said, When Lysias the chief captain shall come down, I will know the uttermost of your matter.

20Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.

21Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”

22Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”

23O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.

24Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.