Ọrụ Ndị Ozi 25

Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a.

Acts 25:14 (UKJV) And when they had been there many days, Festus declared Paul's cause unto the king, saying, There is a certain man left in bonds by Felix:

12Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”

13Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs.

14Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a.

15Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.

16“Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.