21Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
22Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.” Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.”
23Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl.
24Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ.
25Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.