24Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ.
25Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.
26Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede.
27Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”