1Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,
2“Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.
3Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.