Ọrụ Ndị Ozi 26

“Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.

Acts 26:2 (UKJV) I think myself happy, king Agrippa, because I shall answer for myself this day before you concerning all the things whereof I am accused of the Jews:

1Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,

2“Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.

3Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.

4“Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.