Ọrụ Ndị Ozi 27

Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.

Acts 27:6 (UKJV) And there the centurion found a ship of Alexandria sailing into Italy; and he put us therein.

4Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs.

5Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia.

6Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.

7Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.

8Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.