Ọrụ Ndị Ozi 27

Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.

Acts 27:8 (UKJV) And, hardly passing it, came unto a place which is called The fair havens; nigh unto which was the city of Lasea.

6Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya.

7Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.

8Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.

9Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ,

10na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.