Ọrụ Ndị Ozi 4

Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”

Acts 4:7 (UKJV) And when they had set them in the midst, they asked, By what power, or by what name, have all of you done this?

5Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.

6Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.

7Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”

8Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.

9Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.