Ọrụ Ndị Ozi 5

Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.

Acts 5:10 (UKJV) Then fell she down immediately at his feet, and yielded up the spirit: and the young men came in, and found her dead, and, carrying her forth, buried her by her husband.

8Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”

9Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.”

10Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.

11Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.

12Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.