6Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.
7Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya.
8Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”
9Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.”
10Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.