Ọrụ Ndị Ozi 5

Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.

Acts 5:18 (UKJV) And laid their hands on the apostles, and put them in the common prison.

16Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.

17Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi.

18Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.

19Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,

20“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.