Ọrụ Ndị Ozi 5

Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,

Acts 5:19 (UKJV) But the angel of the Lord by night opened the prison doors, and brought them forth, and said,

17Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi.

18Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.

19Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,

20“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”

21Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.