Ọrụ Ndị Ozi 5

“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”

Acts 5:20 (UKJV) Go, stand and speak in the temple to the people all the words of this life.

18Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.

19Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,

20“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”

21Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha.

22Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.