33“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
34Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
35“Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ.
36O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
37“Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’