Ọrụ Ndị Ozi 7

O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.

Acts 7:5 (UKJV) And he gave him none inheritance in it, no, not so much as to set his foot on: yet he promised that he would give it to him for a possession, and to his seed after him, when as yet he had no child.

3Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’

4“Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a.

5O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.

6Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ.

7Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.