Emọs 2

Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.

Amos 2:3 (UKJV) And I will cut off the judge from the midst thereof, and will slay all the princes thereof with him, says the LORD.

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.

2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.

3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.

4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.

5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.