2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.