11Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.
13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.
14Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; ka unu dịrị ndụ. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, dịka unu si kwuo.
15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya. Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu. O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.