9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.
10Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.
11Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.
13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.