7Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.
8Onye mere kpakpando pleiades na orion, onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, wụsa ha nʼelu ala akọrọ, Onyenwe anyị bụ aha ya.
9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.
10Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.
11Unu na-azọpịa ndị ogbenye, na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, ma unu agaghị ebi nʼime ha. Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.