Emọs 5

Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.

Amos 5:7 (UKJV) All of you who turn judgment to wormwood, and leave off righteousness in the earth,

5Unu achọla Betel, unu abanyekwala na Gilgal, maọbụ ga ije ruo Bịasheba. Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ, ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”

6Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ, ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ, ọ ga-erepịa ha. Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.

7Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.

8Onye mere kpakpando pleiades na orion, onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, wụsa ha nʼelu ala akọrọ, Onyenwe anyị bụ aha ya.

9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.