Emọs 5

Ahụhụ dịrị unu, ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.

Amos 5:18 (UKJV) Woe unto you that desire the day of the LORD! to what end is it for you? the day of the LORD is darkness, and not light.

16Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, “Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.

17A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” ka Onyenwe anyị kwuru.

18Ahụhụ dịrị unu, ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.

19Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.

20Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.