2Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?
3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.
5Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.