Emọs 6

Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.

Amos 6:3 (UKJV) All of you that put far away the evil day, and cause the seat of violence to come near;

1Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.

2Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?

3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.

4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.

5Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.