Emọs 6

Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.

Amos 6:5 (UKJV) That chant to the sound of the viol, and invent to themselves instruments of music, like David;

3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.

4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.

5Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.

6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.

7Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.