12Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.
13Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”
14Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.
15Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
16Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “ ‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’