Emọs 7

Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “ ‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’

Amos 7:16 (UKJV) Now therefore hear you the word of the LORD: You says, Prophesy not against Israel, and drop not your word against the house of Isaac.

14Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.

15Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’

16Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “ ‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’

17“Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo. A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ, ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ. A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.