1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya.
2Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”
3Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
4Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
5Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”