3Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
4Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
5Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”
6Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
7Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya.