1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara.
2Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”
3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”
4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
5na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.