3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”
4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
5na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
6Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
7Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”