Emọs 8

Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.

Amos 8:6 (UKJV) That we may buy the poor for silver, and the needy for a pair of shoes; yea, and sell the refuse of the wheat?

4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,

5na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.

6Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.

7Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”

8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa dịka iyi Ijipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.